An Igbo female teacher telling stories to children while under a tree.

Politishịanụ Nkịrịinkị Akwa

Lee ezeonyeagwanam, ọme uche ya;

Otiputala ka mmụọ, ajọ ihe gbarụ afọ.

Ije ya bụ jamgwo m, jamgwo m;

ọ mazụlụ ihe nile, ike ya ghe oye.

Onye n'ayụ nsị n'ime ahịrị nnyemiwu;

ma oji mpoto eficha ike ya.

Ọkpọọ kotu n'otigba anwụ;bekee ukwu ufụrụ.

Onye atị anya, na-awaka ọnụ;onye iberibe, ewu Lọndọnụ.

Bingo ori nsị, ikpuru gbara n'anụ;

aja nwa ihere-eme, onye afọ ukwu n'afọ ọjọọ.

Ọ naghị eche maka gị, kama sọ onwe ya.

Maka ego, orego akọ na uche ya.

Ọ n'eche na-ọbụ nnukwu mmadu;imi tapere n'uzuzu ka ya mma.

Ọ dịghị uru ọ bara karịrị nkịrịinkị akwa.

Mgbeke bu Mgborie

Lee ApụnanwụElelebe ejeghi ọrụmma di kwere,
agbọghọ chom
Nne ya gụrụ ya Mgbeke.
Mgbeke bụ sọsọ mma,
di bịara ya bụ nsụsụ na nsụsụ, ikoro agafu;Ọkpa obodobo,
ajanwaihereme,
mma ihu na obi ọjọọ.

Mgbeke ji iwe gbanwee aha ya,
ọsịkwa n’ọbụ Mgborie kazị mma
Ọ bịa were uri kee onwe ya njọkịrị, na njọkịrị,
Ikoro ọcha nile bido juba ya nri.

Ahamefuna, ikoro onye Ụmụọna si mba-ụwa lọta,
zute Mgbeke bụ Mgborie n’ụzọ Akọkwa;
Chim! Otie mkpu.
I duputaara mụ bụ Atọnanwata ọmarịcha?

Mgbeke bụ Mgborie rụrụ Ahamefuna bụ Atọnanwata.


Gịnị bụ Mma?

Mma bụ ihe dị mma,
mmadụ mara mma,
ụwa mara mma,
Chukwu dị mma.

Lee! Nwanyị mara mma,
Ọ bụ Asa-mpete.
Mpete bụ azụ,
asa bụ nwanyị mara mma.

Azụ mara mma,
Ọ bụ nwanyị mara mma?

Azụ bụ asa bụ mamị wọta.
Afụgo m ọchọ mma na ejighi akụ.

Ịsị gịnị? Akụ bụ mma nwoke.
Mma nwanyị bụ agwa ya.
Aghụghọ dị ya;
mma nwanyị bụ agwa ma mma nwoke bụ akụ.

Mma dịka mma ihunabọ.
Ọna egbu n’ihu na egbu n’azụ.
Onweghi onye iro, onweghi onye ama.
Ikwenye na mma Ị g’abụ onye mmeri oge nile.


Erichaa echere ọzọ

Ụgbọgụlụ mịrị anyụ,
ha bụ nnukwu akwụkwọ nni udummiri.
Ji ụgbọgụlụ enweghi atụ.
Y’abụkwana ji ọfụụ.

Inine bụ akwụkwọ nni osikapa.
Ọ bụkwa akwụkwọ eji ebio ji,
mana ịkpachapụghị anya,
ọ metọọ gị afọ.

Ụgụ bụ akwụkwọ nni.
Ofe akwụkwọ, ofe egwusi na ofe ọgbọnọ;
n’ejere ya ozi.
Ejikwa ya ebio ji.

Ọkazị bụ akwụkwọ nni.
Ọ bụ oke akwụkwọ nni eji agba abacha.
Ejikwa ya esi ofe.
Ụtazị bụ akwụkwọ nni.

Ọ bụ akwụkwọ nni eji ata abacha.
Ejikwa ya ebio ji maọbụ ede.
Akwụkwọ ndịa bụ ike ndị n’eri ya ji aba.


Ụwa

Ụwa abalị dịka ọnwụ.
Ụwa ụtụtụ bu anya ụra akpagharị.
Ụwa ehihie bụ sọsọ ike ọgwụgwụ.
Ụwa eeee! Ụwa ntọọ! Ụwa ntọọ!

Ụwa wara awa,
ma ọnaghị ehi mmiri.

Ụwa kpọjara akpọja,
ma ala ya n’enye nnị.

Ụwa siri ike, ma apịtị dị na ya riri nne.
Ụwa dị egwu, ma ọchịkọtara ụmụ ọnụ.
Ụwa bụ nke onye?
Ụwa n’achọ ndị oma.

Ụwa bụ sọsọ mma;
mụ na gị bị na ya.
Ụwa ekere eke;
onye ọbụla ga-achịta oke nke ya.

Ụwa bụ otu; onye aghakwana nwanne ya.

Trending